Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 144:12-14 Bible Nso (IGBOB)

12. Mb͕e umu-ayi ndikom di ka ihe akuru n'ala, ndi anēme ka ha bùe ibù mb͕e ha di na nwata;Umu-ayi ndinyom di ka ogidi nkuku ulo atuworo akika dika ihe-atù nke ulo uku;

13. Ọba-ayi ejuwo, nēweputa ihe nile di iche iche;Igwè ewu na aturu nile ayi nāmuputa nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, orú nnù na nnù ise orú nnù na nnù ise, n'èzí nile ayi;

14. Anēboju ehi nile ayi ibu nke-ọma;Ọ dighi nitpú di na mb͕idi-ayi, ọ dighi kwa ọpupu di,Ọ dighi kwa iti-nkpu di n'amá nile ayi;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 144