Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 144:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú oké nkumem, bu,Onye nēzí akam abua ilu ọ̀gù:Onye nēzí nkpisi-akam ibu agha:

2. Eberem, na ebem ewusiri ike,Na ulo-elum, na onye m'nwere ime ka m'b͕apu;Na ọtam, na onye m'b͕abàworo nime ya;Onye nāzọda ndim n'okpurum.

3. Jehova, gini ka madu bu, nke I nāmara ya?Na nwa nke madu, nke I nēchè èchìchè bayere ya?

4. Madu yiri otù nku-umeUbọchi-ya nile di ka onyinyo nāgabiga.

5. Jehova, rulata elu-igwe-Gi, we rida:Metu ugwu aka, ha gākwu kwa anwuru-ọku.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 144