Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 143:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, nuru ekperem; ṅa nti n'aririọ-amaram nile:N'ikwesi-ntukwasi-obi-Gi zam, na n'ezi omume-Gi.

2. Eji-kwa-la orù-Gi ba n'ikpé;N'ihi na ọ dighi onye ọ bula nke di ndu bu onye ezi omume n'iru Gi.

3. N'ihi na onye-iro esob͕uwo nkpuru-obim;Ọ zọpiawo ndum n'ala:O mewom ka m'biri n'ebe di iche iche b͕ara ọchichri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi.

4. Mọm we ghara inwe ike nimem;Ibobo nānwu obim nimem.

5. Echetawom ubọchi nile nke mb͕e ochie;Atughariwom uche n'omume-Gi nile:N'ọlu aka-Gi abua ka m'tughariworo obi.

6. Ab͕asawom akam abua n'ebe I nọ:Nkpuru-obim di ka ala nke ida-#mbà n'ebe I nọ. Selah

7. Zam ngwa ngwa, Jehova; mọm agwusiwo:Ezonarilam iru-Gi;Ka m'we ghara iyi ndi nārida n'olùlù.

8. Mem ka m'nuru ebere-Gi n'ututu;N'ihi na Gi ka m'tukwasiworo obi:Mem ka m'mara uzọ nke m'gēje ije nime ya;N'ihi na Gi ka m'buliworo nkpuru-obim nye.

9. Naputam n'aka ndi-irom, Jehova:N'ebe I nọ ka m'kpuchiworo onwem.

10. Zím ime ihe di Gi utọ; n'ihi na Gi onwe-gi bu Chinekem:Mọ-Gi di nma; durum n'ala di lari.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 143