Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 140:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. Asirim Jehova, Chinekem ka I bu:Ṅa nti olu aririọ-amaram nile, Jehova.

7. Jehova, Onye-nwe-ayi, ike nke nzọputam,I kpuchiwo isim n'ubọchi ihe-agha nile.

8. Jehova, enyela ihe onye nēmebi iwu nāchọsi ike;Emela ka nzube ọjọ ya gara ya; ha nēbuli onwe-ha elu. Selah

9. Ma isi ndi nọm buruburu,Ka nmeb͕u nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha kpuchie ha.

10. Ka ha me ka icheku-ọku me nkpatu imegide ha:Ya me ka ha dabà n'ọku;N'ob͕u-miri, ka ha we ghara ibili ọzọ.

11. Madu nke nwere ire ọjọ agaghi-eguzosi ike n'uwa:Madu nke nēme ihe-ike, ihe ọjọ ga-chunta ya inudasi ya.

12. Amawom na Jehova gēmezi okwu-ikpe onye ewedara n'ala,Na ikpé ziri ezi nke ndi-ob͕eye.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 140