1. Jehova, dọputam n'aka madu ọjọ;Chebem ka m'ghara ida n'aka nwoke nēme ihe-ike di iche iche:
2. Ndi chèworo ihe ọjọ di iche iche n'obi-ha;Ubọchi nile ọ bula ka ha nēzukọ ibu agha di iche iche.
3. Ha amuwo ire-ha dika agwọ;Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha. Selah
4. Debem, Jehova, ka m'ghara ida n'aka onye nēmebi iwu;Chebem, ka m'ghara ida n'aka nwoke nēme ihe-ike:Bú ndi chèworo inuda nzọ-ukwum nile.
5. Ndi-npako ezobeworom ib͕udu, na udọ̀ di iche iche;Ha ab͕asowo ub͕u n'akuku uzọ;Ọnyà di iche iche ka ha siworom. Selah
6. Asirim Jehova, Chinekem ka I bu:Ṅa nti olu aririọ-amaram nile, Jehova.
7. Jehova, Onye-nwe-ayi, ike nke nzọputam,I kpuchiwo isim n'ubọchi ihe-agha nile.