Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 139:2-7 Bible Nso (IGBOB)

2. Gi onwe-gi amawo nnọdu-alam na nbili-ọtọm,I nāghọta èchìchèm nile site n'ebe di anya.

3. Okporo-uzọm na ndina-alam ka I fùchaworo dika ọka,Ọ bu kwa uzọm nile ka I maworo nke-ọma.

4. N'ihi na ọ dighi okwu di n'irem,Ma, le, Jehova, I machasiwo ya.

5. N'azu na n'iru ka I nọchigideworom, we tukwasi ọbu-aka-Gi n'arum.

6. Ọmuma-ihe di otú a dikaririm ebube;Ọ dika elu, apughm iru ya.

7. Òle ebe m'gālanari Mọ-Gi?Ma-ọbu òle ebe m'gēsi n'iru Gi b͕alaga?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 139