Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 139:17-23 Bible Nso (IGBOB)

17. Le ka èchìchè-Gi nile si di oké ọnu-ahia n'anyam, Chineke!Le ka ọnu-ọgugu nile ha si di uku ri nne!

18. Ọ buru na aguam ha ọnu, ha bara uba kari ájá:Mb͕e m'tetaworo, mu na I nānọgide.

19. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I b͕ue onye nēmebi iwu, Chineke:Ya mere, unu ndi-ọbara, sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu.

20. Ha bu ndi nēkwu okwu megide Gi nime nzube ọjọ,Ndi ebuliworo nye ihe-efu ka ndi-iro-Gi bu.

21. Ọ̀ bughi ndi nākpọ Gi asì, jehova, ka m'nākpọ asì?Ọ̀ bughi kwa ndi nēbili imegide Gi ka m'nāsọ oyi?

22. Ọ bu ikpọ-asì nke zuru okè ka m'ji kpọ ha asì:Ndi-iro ka ha burum.

23. Gwuputa ala obim, Chineke, we mara obim:Nānwam, we mara iche-uchem nile:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 139