Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 138:3-7 Bible Nso (IGBOB)

3. N'ubọchi m'kpọkuru Gi ka I zaram,I nēji ike di na nkpuru-obim kpaliem.

4. Eze nile nke uwa gēkeli Gi, Jehova,N'ihi na ha anuwo okwu nile nke ọnu-Gi.

5. Ha gābù kwa abù bayere uzọ nile nke Jehova;N'ihi na ebube Jehova di uku.

6. N'ihi na Jehova di elu, ma ọ bu onye di ume-ala n'obi ka Ọ nāhu anya:Ma onye-npako, Ọ nēsite n'ebe di anya mara ya.

7. Ọ buru na ejeghariam n'etiti ahuhu,I gēme ka m'di ndu; I gēseti aka-Gi imegide iwe ndi-irom,Aka-nri-Gi gāzọputakwam.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 138