Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 136:13-25 Bible Nso (IGBOB)

13. Kelenu Onye kebiworo Oké Osimiri Uhie:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

14. O we me ka Israel gabiga n'etiti ya:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

15. Ma O rurupuru Fero na usu-ndi-agha-ya n'Oké Osimiri Uhie:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

16. Kelenu Onye nēme ka ndi-Ya je ije n'ọzara:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ēbi ka ebere-Ya di.

17. Kelenu Onye tib͕uworo ndi-eze di uku:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

18. O b͕u-kwa-ra ndi-eze di ebube:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

19. Bú Saihon eze ndi-Amorait:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

20. Na Og eze Beshan:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

21. O we nye ala-ha ibu ihe-nketa:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

22. Iburu Israel, bú orù-Ya, ihe-nketa:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

23. Onye chetara ayi n'ọnọdu-ayi di ala:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

24. O we naputa ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi.N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

25. Ọ nēnye anu-aru nile nri:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 136