Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 132:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, chetara DevidNweda-n'ala-ya nile.

2. Otú ọ ṅuru Jehova iyi,Kwe Dike nke Jekob nkwa:

3. N'ezie m'gaghi-abà n'ulo-ikwū nke ulom,M'gaghi-arigo n'elu ihe-ndina nke utem;

4. M'gaghi-enye anyam abua ura,M'gaghi-enye mbubere-anyam irù-ura;

5. Rue mb͕e m'gāchọtara Jehova ọnọdu,Chọtara Dike nke Jekob ebe-obibi.

6. Le, ayi nuru okwu bayere ya n'Efrata:Ayi chọtara ya n'ọhia nke oké ọhia.

7. Ka ayi ba n'ebe-obibi-Ya nile;Ka ayi kpọ isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di.

8. Bilie, Jehova, ba n'ebe-izu-ike-Gi;Gi onwe-gi, na ib͕e nke ike-Gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 132