1. Jehova, chetara DevidNweda-n'ala-ya nile.
2. Otú ọ ṅuru Jehova iyi,Kwe Dike nke Jekob nkwa:
3. N'ezie m'gaghi-abà n'ulo-ikwū nke ulom,M'gaghi-arigo n'elu ihe-ndina nke utem;
4. M'gaghi-enye anyam abua ura,M'gaghi-enye mbubere-anyam irù-ura;
5. Rue mb͕e m'gāchọtara Jehova ọnọdu,Chọtara Dike nke Jekob ebe-obibi.
6. Le, ayi nuru okwu bayere ya n'Efrata:Ayi chọtara ya n'ọhia nke oké ọhia.
7. Ka ayi ba n'ebe-obibi-Ya nile;Ka ayi kpọ isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di.
8. Bilie, Jehova, ba n'ebe-izu-ike-Gi;Gi onwe-gi, na ib͕e nke ike-Gi.
9. Ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri ezi omume dika uwe;Ka ndi-ebere-Gi tikwa nkpu ọnu.
10. N'ihi Devid, bú orù-Gi,Atugharila iru onye-Gi etere manu.
11. Jehova aṅuworo Devid iyi bu ezi-okwu;Ọ gaghi-esi na ya laghachi azu:Ndi sitere na nkpuru nke afọ-gi ka M'gādọkwasi n'oche-eze i nwere.