Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 130:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ob͕u-miri nile ka m'siworo kpọkue Gi, Jehova.

2. Onye-nwem, ge nti olum:Ka nti-Gi nāṅa kwa ntiN'olu nke aririọ-amaram nile.

3. Ọ buru na I riba ajọ omume nile ama, Ja,Onye-nwe-ayi, ònye gēguzo?

4. Ma n'aka-Gi ka nb͕aghara di,Ka ewe tua egwu Gi.

5. Elewom anya Jehova, nkpuru-obim elewo anya,Ọ bu kwa okwu-Ya ka m'chereworo.

6. Nkpuru-obim nēchere Jehova,Karia ka ndi-nche si echere ututu;E, karia ka ndi-nche si echere ututu.

7. Israel, chere Jehova:N'ihi na n'aka Jehova ka ebere di,Nb͕aputa riri nne di kwa n'aka-Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 130