Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 129:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọtutu mb͕e ka ha kpab͕uworom site na mb͕e m'di na nwata,Biko, ka Israel kwue otú a, si,

2. Ọtutu mb͕e ka ha kpab͕uworom site na mb͕e m'di na nwata:Ma otú ọ di, ha apughi imegidem.

3. N'elu azum ka ndi-plough jiri plough gwu dika esi egwu ala-ubi;Ha mere ka furrow nile ha di ogologo.

4. Jehova bu onye ezi omume:O bipuwo udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu.

5. Ka ihere me ha, ka ha laghachi kwa azu,Bú ndi nile nākpọ Zaion asì.

6. Ka ha di ka ahihia nēpú n'elu ulo,Nke nākpọnwu mgbe o puputara:

7. Nke onye nēwe ihe-ubi nējighi kpojue ọbu-aka-ya,Onye nēhie ùkwù-ọka nējighi kwa ya kpojue obi-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 129