Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 123:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Gi ka m'gēweli anyam abua le,Gi Onye nānọdu ala n'elu-igwe.

2. Le, dika anya ndi-orù si elekwasi aka ndi-nwe-ha,Dika anya abua nke nwayi nēje ozi si elekwasi aka nwayi nwere ike n'aru ya;Otú a ka anya-ayi nēlekwasi Jehova, bú Chineke-ayi,Rue mb͕e Ọ gēmere ayi amara.

3. Mere ayi amara, Jehova, mere ayi amara:N'ihi na nleda ejuwo ayi afọ ri nne.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 123