18. Ja adọwom aka na nti nke-uku:Ma ọ bughi n'aka ọnwu ka O nyeworom.
19. Megherenum ọnu-uzọ-ama nile nke ezi omume:M'gābà nime ha, m'gēkele Ja.
20. Nka bu ọnu-uzọ-ama Jehova nwere;Ndi ezi omume gābà nime ya.
21. M'gēkele Gi, n'ihi na I zawom,I we ghọrọm nzọputa.
22. Nkume nke ndi nēwu ulo juruAghọwo isi nkuku ulo.
23. Ọ bu n'aka Jehova ka nka sitere;Nke ahu bu oké ọlu n'anya-ayi.
24. Nka bu ubọchi Jehova meworo;Ayi gētegari egwú ọṅù, ṅuri kwa ọṅu nime ya.
25. Biko, Jehova, zọputa, biko:Biko, Jehova, me ka ihe nāgara ayi nke-ọma, biko.
26. Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Jehova:Ayi esiwo n'ulo Jehova gọzie unu.
27. Chineke ka Jehova bu, Ọ nyewo kwa ayi ìhè:Chiri udọ̀ ke àjà-ememe, durue ya na mpi nile nke ebe-ichu-àjà.