Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 118:17-28 Bible Nso (IGBOB)

17. M'gaghi-anwu, kama m'gādi ndu,M'gākọ kwa akukọ ọlu nile nke Ja.

18. Ja adọwom aka na nti nke-uku:Ma ọ bughi n'aka ọnwu ka O nyeworom.

19. Megherenum ọnu-uzọ-ama nile nke ezi omume:M'gābà nime ha, m'gēkele Ja.

20. Nka bu ọnu-uzọ-ama Jehova nwere;Ndi ezi omume gābà nime ya.

21. M'gēkele Gi, n'ihi na I zawom,I we ghọrọm nzọputa.

22. Nkume nke ndi nēwu ulo juruAghọwo isi nkuku ulo.

23. Ọ bu n'aka Jehova ka nka sitere;Nke ahu bu oké ọlu n'anya-ayi.

24. Nka bu ubọchi Jehova meworo;Ayi gētegari egwú ọṅù, ṅuri kwa ọṅu nime ya.

25. Biko, Jehova, zọputa, biko:Biko, Jehova, me ka ihe nāgara ayi nke-ọma, biko.

26. Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Jehova:Ayi esiwo n'ulo Jehova gọzie unu.

27. Chineke ka Jehova bu, Ọ nyewo kwa ayi ìhè:Chiri udọ̀ ke àjà-ememe, durue ya na mpi nile nke ebe-ichu-àjà.

28. Chinekem ka I bu, m'gēkele kwa Gi:Chinekem ka I bu, m'gēbuli Gi elu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 118