Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 118:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

2. Biko, ka Israel si,Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

3. Biko, ka ulo Eron si,Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

4. Biko, ka ndi nātu egwu Jehova si,Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

5. M'siri na nkpàm kpọkue Ja;Ja zaram, me ka m'nọdu n'ebe sara mbara.

6. Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu:Gini ka madu gēmem?

7. Jehova dirim n'etiti ndi nēyerem aka:Mu onwem gēlekwasi kwa ndi nākpọm asì.

8. Ọ di nma ib͕abà nime JehovaKari itukwasi madu obi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 118