1. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
2. Biko, ka Israel si,Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
3. Biko, ka ulo Eron si,Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
4. Biko, ka ndi nātu egwu Jehova si,Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
5. M'siri na nkpàm kpọkue Ja;Ja zaram, me ka m'nọdu n'ebe sara mbara.
6. Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu:Gini ka madu gēmem?
7. Jehova dirim n'etiti ndi nēyerem aka:Mu onwem gēlekwasi kwa ndi nākpọm asì.
8. Ọ di nma ib͕abà nime JehovaKari itukwasi madu obi.
9. Ọ di nma ib͕abà nime JehovaKari itukwasi ndi amara aha-ha obi.
10. Mba nile ab͕awom buruburu:N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.
11. Ha ab͕awom buruburu; e, ha ab͕awom buruburu:N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.
12. Ha ab͕awom buruburu dika aṅu; emenyuwo ha dika ọku ogwu:N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.
13. I nudawom enuda ka m'we da:Ma Jehova yerem aka.
14. Ikem na abù ọmam ka Ja bu:Ọ ghọwo-kwa-ram nzọputa.
15. Olu nke iti-nkpu-ọṅù na nzọputa di n'ulo-ikwū nile nke ndi ezi-omume:Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.
16. Ebuliwo aka-nri Jehova elu:Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.
17. M'gaghi-anwu, kama m'gādi ndu,M'gākọ kwa akukọ ọlu nile nke Ja.
18. Ja adọwom aka na nti nke-uku:Ma ọ bughi n'aka ọnwu ka O nyeworom.
19. Megherenum ọnu-uzọ-ama nile nke ezi omume:M'gābà nime ha, m'gēkele Ja.
20. Nka bu ọnu-uzọ-ama Jehova nwere;Ndi ezi omume gābà nime ya.