1. Ọ bughi ayi, Jehova, ọ bughi ayi,Kama ọ bu aha-Gi ka I gēnye nsọpuru,N'ihi ebere-Gi, na n'ihi ezi-okwu-Gi.
2. N'ìhi gini ka mba nile nāsi,Biko, òle ebe Chineke-ha nọ?
3. Ma Chineke-ayi nọ n'elu-igwe:Ihe nile nke tọrọ Ya utọ ka O meworo.
4. Arusi nile ha bu ọla-ọcha na ọla-edo,Ọlu aka madu.
5. Ha nwere ọnu, ma ha adighi-ekwu okwu;Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ;
6. Ha nwere nti abua, ma ha adighi-anu ihe;Ha nwere imi, ma ha adighi-anuta ísì;
7. Ha nwere aka-ha abua, ma ha adighi-ebitu ihe;Ha nwere ukwu-ha abua, ma ha adighi-eje ije;Ha adighi-ewere akpiri-ha me uṅara.
8. Ndi nēme ha gādi ka ha:E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi.
9. Israel, tukwasi Jehova obi:Iye-aka-ha na ọta-ha ka Ọ bu.
10. Ulo Eron, tukwasinu Jehova obi:Iye-aka-ha na ọta-ha ka Ọ bu.