Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 115:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ bughi ayi, Jehova, ọ bughi ayi,Kama ọ bu aha-Gi ka I gēnye nsọpuru,N'ihi ebere-Gi, na n'ihi ezi-okwu-Gi.

2. N'ìhi gini ka mba nile nāsi,Biko, òle ebe Chineke-ha nọ?

3. Ma Chineke-ayi nọ n'elu-igwe:Ihe nile nke tọrọ Ya utọ ka O meworo.

4. Arusi nile ha bu ọla-ọcha na ọla-edo,Ọlu aka madu.

5. Ha nwere ọnu, ma ha adighi-ekwu okwu;Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ;

6. Ha nwere nti abua, ma ha adighi-anu ihe;Ha nwere imi, ma ha adighi-anuta ísì;

7. Ha nwere aka-ha abua, ma ha adighi-ebitu ihe;Ha nwere ukwu-ha abua, ma ha adighi-eje ije;Ha adighi-ewere akpiri-ha me uṅara.

8. Ndi nēme ha gādi ka ha:E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi.

9. Israel, tukwasi Jehova obi:Iye-aka-ha na ọta-ha ka Ọ bu.

10. Ulo Eron, tukwasinu Jehova obi:Iye-aka-ha na ọta-ha ka Ọ bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 115