Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 11:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Na Jehova ka m'b͕abàworo:Ùnu si aṅa si nkpuru-obim,Felaganu n'ugwu-unu dika nnunu?

2. N'ihi na, le, ndi nēmebi iwu nāzọ uta-ha ukwu ikwe ya,Ha edoziwo àkù-ha n'elu eriri-uta,Ib͕a ndi obi-ha ziri ezi n'ochichiri.

3. N'ihi na anākwada ide nile;Gini ka onye ezi omume meworo?

4. Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ,Jehova, n'elu-igwe ka oche-eze-Ya di;Anya-Ya nāhu, mbubere-anya-Ya nānwa, umu madu.

5. Jehova n'anwa onye ezi omume:Ma onye nēmebi iwu na onye nāhu ihe-ike n'anya ka nkpuru-obi-Ya nākpọ asì.

6. Ya me ka ib͕udu zokwasi ndi nēmebi iwu dika miri-ozuzo;Ka ọku na brimstone na ifufe di ọku buru òkè ìko-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 11