Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 109:6-14 Bible Nso (IGBOB)

6. Me ka onye nēmebi iwu lekọta ya:Ka onye-nmegide guzo kwa n'aka-nri-ya.

7. Mb͕e anēkpe ya ikpe, ya puta ìhè na ọ bu onye ikpe mara;Ka ekpere-ya ghọ kwa nmehie.

8. Ka ubọchi-ya di ole-na-ole;Ka onye ọzọ nara ya ihe-nlekọta-ya.

9. Ka umu-ya buru umu-nb͕ei,Ka nwunye-ya buru nwayi di-ya nwuru.

10. Ka umu-ya nāṅaghari kwa mb͕e nile nāriọ kwa aririọ;Ka ha si kwa na nkponkpọ-ebe-ha nile nāchọ ihe-oriri-ha n'ebe di anya.

11. Ka onye-nbinye siri ihe nile o nwere ọnyà;Ka ndi ala ọzọ luta ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inweta n'agha.

12. Ekwela ka o nwe onye nọ nēmere ya ebere;Ekwe-kwa-la ka onye ọ bula di nke nēmere umu-nb͕ei-ya amara.

13. Ka eriri-umu-ya diri nbipu;N'ọb͕ọ soro ha ka ehichapu aha-ha.

14. Ka echetara Jehova ajọ omume nna-ya-hà;Ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie nne-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 109