5. Ha we tukwasim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Na ikpọ-asì n'ọnọdu ihu-n'anyam.
6. Me ka onye nēmebi iwu lekọta ya:Ka onye-nmegide guzo kwa n'aka-nri-ya.
7. Mb͕e anēkpe ya ikpe, ya puta ìhè na ọ bu onye ikpe mara;Ka ekpere-ya ghọ kwa nmehie.
8. Ka ubọchi-ya di ole-na-ole;Ka onye ọzọ nara ya ihe-nlekọta-ya.
9. Ka umu-ya buru umu-nb͕ei,Ka nwunye-ya buru nwayi di-ya nwuru.
10. Ka umu-ya nāṅaghari kwa mb͕e nile nāriọ kwa aririọ;Ka ha si kwa na nkponkpọ-ebe-ha nile nāchọ ihe-oriri-ha n'ebe di anya.
11. Ka onye-nbinye siri ihe nile o nwere ọnyà;Ka ndi ala ọzọ luta ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inweta n'agha.
12. Ekwela ka o nwe onye nọ nēmere ya ebere;Ekwe-kwa-la ka onye ọ bula di nke nēmere umu-nb͕ei-ya amara.
13. Ka eriri-umu-ya diri nbipu;N'ọb͕ọ soro ha ka ehichapu aha-ha.
14. Ka echetara Jehova ajọ omume nna-ya-hà;Ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie nne-ya.
15. Ka ha di n'iru Jehova mb͕e nile,Ka O we bipu ncheta-ha n'uwa.
16. N'ihi na o chetaghi ime ebere,O we sob͕ue nwoke ewedara n'ala na ob͕eye,Na onye obi-ya mebiri emebi, ime ka ha nwua.
17. Ọ hu-kwa-ra nkọcha n'anya, o we biakute ya;Ngọzi atọghi kwa ya utọ, o we di anya n'ebe ọ nọ.
18. O yiri-kwa-ra nkọcha dika uwe-nwuda-ya,O we ba nime ya dika miri,Ba kwa n'ọkpukpu-ya nile dika manu.
19. Ya diri ya ka uwe oji kpuchi onwe-ya,Ya buru kwa akpukpọ-úkwù o ji ke úkwù mb͕e nile.
20. Nka bu ugwọ-ọlu nke ndi nēmegidem, nke nēsi n'aka Jehova bia,Ọ bu kwa ugwọ-ọlu nke ndi nēkwu ihe ọjọ megide nkpuru-obim.
21. Ma Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye-nwe-ayi, kwe ka mu na I mekọ n'ihi aha-Gi:N'ihi na ebere-Gi di nma, naputam.
22. N'ihi na onye ewedara n'ala na ob͕eye ka m'bu,Adupuwo kwa nkpuru-obim nimem.
23. Dika onyinyo mb͕e ọ nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu, otú a ka m'laworo:Arurupuwom dika igurube.
24. Ikperè-ukwum abua asuwo ngọngọ site n'obubu-ọnu;Anu-arum nāta aru nēnweghi abuba.
25. Mu onwem, aghọwo-kwa-ram ha ihe-ita-uta:Mb͕e ha nāhum ha nēfufe isi-ha.