Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 109:25-30 Bible Nso (IGBOB)

25. Mu onwem, aghọwo-kwa-ram ha ihe-ita-uta:Mb͕e ha nāhum ha nēfufe isi-ha.

26. Yerem aka, Jehova, Chinekem;Zọputam dika ebere-Gi si di:

27. Ka ha mara kwa na aka-Gi ka nka bu;Gi onwe-gi, Jehova, emewo ya.

28. Ndi ahu gākọcha, ma Gi onwe-gi nāgọzi:Ha ebiliwo, ihere we me ha, ma orù-Gi gāṅuri.

29. Ndi nēmegidem gēyiri ọnọdu-ihere dika uwe,Ha gēwere kwa ihere-ha kpuchie onwe-ha dika uwe-nwuda.

30. M'gēwere ọnum kele Jehova nke-uku;E, n'etiti ọtutu madu ka m'gēto Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 109