21. Ma Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye-nwe-ayi, kwe ka mu na I mekọ n'ihi aha-Gi:N'ihi na ebere-Gi di nma, naputam.
22. N'ihi na onye ewedara n'ala na ob͕eye ka m'bu,Adupuwo kwa nkpuru-obim nimem.
23. Dika onyinyo mb͕e ọ nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu, otú a ka m'laworo:Arurupuwom dika igurube.
24. Ikperè-ukwum abua asuwo ngọngọ site n'obubu-ọnu;Anu-arum nāta aru nēnweghi abuba.
25. Mu onwem, aghọwo-kwa-ram ha ihe-ita-uta:Mb͕e ha nāhum ha nēfufe isi-ha.
26. Yerem aka, Jehova, Chinekem;Zọputam dika ebere-Gi si di:
27. Ka ha mara kwa na aka-Gi ka nka bu;Gi onwe-gi, Jehova, emewo ya.
28. Ndi ahu gākọcha, ma Gi onwe-gi nāgọzi:Ha ebiliwo, ihere we me ha, ma orù-Gi gāṅuri.
29. Ndi nēmegidem gēyiri ọnọdu-ihere dika uwe,Ha gēwere kwa ihere-ha kpuchie onwe-ha dika uwe-nwuda.
30. M'gēwere ọnum kele Jehova nke-uku;E, n'etiti ọtutu madu ka m'gēto Ya.