Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 109:18-30 Bible Nso (IGBOB)

18. O yiri-kwa-ra nkọcha dika uwe-nwuda-ya,O we ba nime ya dika miri,Ba kwa n'ọkpukpu-ya nile dika manu.

19. Ya diri ya ka uwe oji kpuchi onwe-ya,Ya buru kwa akpukpọ-úkwù o ji ke úkwù mb͕e nile.

20. Nka bu ugwọ-ọlu nke ndi nēmegidem, nke nēsi n'aka Jehova bia,Ọ bu kwa ugwọ-ọlu nke ndi nēkwu ihe ọjọ megide nkpuru-obim.

21. Ma Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye-nwe-ayi, kwe ka mu na I mekọ n'ihi aha-Gi:N'ihi na ebere-Gi di nma, naputam.

22. N'ihi na onye ewedara n'ala na ob͕eye ka m'bu,Adupuwo kwa nkpuru-obim nimem.

23. Dika onyinyo mb͕e ọ nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu, otú a ka m'laworo:Arurupuwom dika igurube.

24. Ikperè-ukwum abua asuwo ngọngọ site n'obubu-ọnu;Anu-arum nāta aru nēnweghi abuba.

25. Mu onwem, aghọwo-kwa-ram ha ihe-ita-uta:Mb͕e ha nāhum ha nēfufe isi-ha.

26. Yerem aka, Jehova, Chinekem;Zọputam dika ebere-Gi si di:

27. Ka ha mara kwa na aka-Gi ka nka bu;Gi onwe-gi, Jehova, emewo ya.

28. Ndi ahu gākọcha, ma Gi onwe-gi nāgọzi:Ha ebiliwo, ihere we me ha, ma orù-Gi gāṅuri.

29. Ndi nēmegidem gēyiri ọnọdu-ihere dika uwe,Ha gēwere kwa ihere-ha kpuchie onwe-ha dika uwe-nwuda.

30. M'gēwere ọnum kele Jehova nke-uku;E, n'etiti ọtutu madu ka m'gēto Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 109