1. Chineke nke otutom, ab͕ala nkiti;
2. N'ihi na ọnu onye nēmebi iwu na ọnu aghughọ ka ha sagheworo megidem:Ha ewerewo ire okwu-ugha gwam okwu.
3. Ha ewerewo kwa okwu ikpọ-asì b͕am buruburu,We busom agha n'efu.
4. N'ọnọdu ihu-n'anya m'huru ha ha nēmegidem:Ma mu onwem nọ nēkpe ekpere.
5. Ha we tukwasim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Na ikpọ-asì n'ọnọdu ihu-n'anyam.
6. Me ka onye nēmebi iwu lekọta ya:Ka onye-nmegide guzo kwa n'aka-nri-ya.
7. Mb͕e anēkpe ya ikpe, ya puta ìhè na ọ bu onye ikpe mara;Ka ekpere-ya ghọ kwa nmehie.