23. O we si na O gēkpochapu ha,Ma ọ buru na Moses, bú onye Ọ rọputaworo, eguzoghi na ntiwa ahu n'iru Ya,Ime ka ọnuma-Ya si n'ibibi ha laghachi.
24. Ọzọ, ha juru ala anāchọsi ike,Ha ekweghi okwu-Ya;
25. Ha we tamu n'ulo-ikwū nile ha,Ha egeghi nti n'olu Jehova.
26. O we welie aka-Ya elu n'ebe ha nọ,Ime ka ha da n'ọzara:
27. Na ime ka nkpuru-ha da n'etiti mba nile,Na ichusa ha n'ala nile.
28. Ha kekọta-kwa-ra onwe-ha n'aru Beal-peoa,We rie àjà nile nke ihe nwuru anwu.
29. Ha we were omume nile ha kpasue Ya iwe:Ihe-otiti we dakwasi ha.
30. Finehas wee guzo ọtọ, me ihe ekpere n'ikpe:Ewe b͕ochi ihe-otiti ahu.
31. Ewe guara ya nka n'ezi omume,Rue ọb͕ọ nile rua mb͕e ebighi-ebi.
32. Ha kpasu-kwa-ra Ya iwe na miri Meriba,O we jọrọ Moses njọ n'ihi ha:
33. N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru Mọ-Ya,O we were eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua kwue okwu efu.