16. Ha kwo-kwa-ra Moses ekworo n'ọmuma-ulo-ikwū-ha,Kwo kwa Eron, bú onye nsọ nke Jehova.
17. Ala nēmeghe, we loda Detan,Kpuchi kwa nzukọ Abairam.
18. Ọku we nēre n'etiti nzukọ-ha;Ire-ọku nērepia ndi nēmebi iwu.
19. Ha nēme nwa-ehi na Horeb,We kpọ isi ala nye ihe awuru awu.
20. Ha we b͕anwe nsọpuru-haN'ihe-atù nke ehi nāta ihe akuru n'ala.
21. Ha chezọrọ Chineke, bú Onye-nzọputa-ha,Onye nēmeri ihe uku di iche iche n'Ijipt;
22. Oké ọlu di iche iche n'ala Ham,Na ihe di egwu di iche iche n'akuku Oké Osimiri Uhie.
23. O we si na O gēkpochapu ha,Ma ọ buru na Moses, bú onye Ọ rọputaworo, eguzoghi na ntiwa ahu n'iru Ya,Ime ka ọnuma-Ya si n'ibibi ha laghachi.
24. Ọzọ, ha juru ala anāchọsi ike,Ha ekweghi okwu-Ya;
25. Ha we tamu n'ulo-ikwū nile ha,Ha egeghi nti n'olu Jehova.
26. O we welie aka-Ya elu n'ebe ha nọ,Ime ka ha da n'ọzara:
27. Na ime ka nkpuru-ha da n'etiti mba nile,Na ichusa ha n'ala nile.
28. Ha kekọta-kwa-ra onwe-ha n'aru Beal-peoa,We rie àjà nile nke ihe nwuru anwu.