13. Ha chezọrọ ọlu-Ya nile ngwa ngwa;Ha echeghi ndum-ọdu-Ya:
14. Ha we chọ ajọ ọchichọ n'ọzara,We nwa Chineke n'ala tọb͕ọrọ n'efu.
15. O we nye ha ihe ha riọrọ;Ma O zitere aru-ọtita na nkpuru-obi-ha.
16. Ha kwo-kwa-ra Moses ekworo n'ọmuma-ulo-ikwū-ha,Kwo kwa Eron, bú onye nsọ nke Jehova.
17. Ala nēmeghe, we loda Detan,Kpuchi kwa nzukọ Abairam.
18. Ọku we nēre n'etiti nzukọ-ha;Ire-ọku nērepia ndi nēmebi iwu.
19. Ha nēme nwa-ehi na Horeb,We kpọ isi ala nye ihe awuru awu.