Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 103:12-19 Bible Nso (IGBOB)

12. Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu,Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ.

13. Dika nna si enwe obi-ebere n'aru umu-ya,Otú a ka Jehova nwere obi-ebere n'aru ndi nātu egwu Ya.

14. N'ihi na Ya onwe-ya mara otú akpuworo ayi;Ọ nēcheta na ájá ka ayi bu.

15. Ma madu, dika ahihia ka ubọchi-ya nile di;Dika okoko-osisi ọhia, otú a ka ọ nāwa okoko.

16. N'ihi na ifufe agabigawo ya n'isi, o we ghara idi;Ọnọdu-ya agaghi-ama kwa ya ọzọ.

17. Ma ebere nke Jehova nēsi na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi n'aru ndi nātu egwu Ya,Ezi omume-Ya di-kwa-ra umu umu;

18. Ọ diri ndi nēdebe ọb͕ub͕a-ndu-Ya,Di-kwa-ra ndi nēcheta ukpuru-Ya ime ha.

19. Jehova emewo ka oche-eze-Ya guzosie ike n'elu-igwe;Ala-eze-Ya nāchi kwa ihe nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 103