Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 103:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Gọzie Jehova, nkpuru-obim;Ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya.

2. Gọzie Jehova, nkpuru-obim,Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi:

3. Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile;Onye nāgwọ ọria-gi nile;

4. Onye nāb͕aputa ndu-gi n'aka nbibi;Onye nēkpube gi okpu-eze, bú ebere na obi-ebere di iche iche:

5. Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi;Idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọhu dika ugo.

6. Jehova nēmere ndi nile anēmeb͕uEzi omume nile na ihe nile O kpere n'ikpe.

7. Ọ nēme ka Moses mara uzọ-Ya nile,Ọ nēme kwa ka umu Israel mara omume-Ya nile.

8. Jehova nwere obi-ebere, nēme kwa amara,Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n'ebere.

9. Ọ bughi rue mgbe nile ka Ọ ganēse okwu;Ọ bughi kwa rue mb͕e ebighi-ebi ka Ọ ganēdebe iwe.

10. Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi,Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi.

11. N'ihi na dika idi-elu nke elu-igwe si di n'elu uwa,Otú a ka ebere-Ya di ike n'aru ndi nātu egwu Ya.

12. Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu,Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ.

13. Dika nna si enwe obi-ebere n'aru umu-ya,Otú a ka Jehova nwere obi-ebere n'aru ndi nātu egwu Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 103