Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Nke Abù 5:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Abatawom n'ubim ab͕ara ogige, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem:Aghọrọwom myrrh nkem, ya na udam;Arachawom ub͕ub͕ọ-manu-aṅum, ya na manu-aṅum;Aṅuwom manya-vine nkem, ya na miri-ara-ehim.Rienu ihe, ndi-eyim;Ṅuanu ihe-ọṅuṅu, e, ṅujuenu afọ unu ndi ihe-unu nātọm utọ.

2. Mu onwem nāraru ura, ma obim nēteta:Ọ bu olu nke onye ihe-ya nātọm utọ nāku aka n'uzọ, si,Megherem uzọ, nwa-nnem nwayi, eyìm, ndurum, onye nkem nke zuru okè:N'ihi na isim juputara n'igirigi,Agiri-isim juputara n'ọbubu-miri nke abali.

3. Eyipuwom uwem; #m'gēsi aṅa yiri ya?Asawom ukwum abua; #m'gēsi aṅa me ka ha rue inyi?

4. Onye ihe-ya nātọm utọ setipuru aka-ya tiye n'oghere uzọ,Afọm we me nkpatu n'ihi ya.

5. Mu onwem biliri imeghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ;Akam abua nābusi kwa na myrrh,Nkpisi-akam nile nābusi kwa na myrrh nērù erù,N'elu nkpisi nile nke ugodi.

6. Mu onwem meghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ;Ma onye ihe-ya nātọm utọ wezugarari onwe-ya, gabiga.Nkpuru-obim apuwori mb͕e o kwuru okwu:Achọrọm ya, ma Achọtaghm ya;Akpọrọm ya òkù, ma ọ zaghm.

7. Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum,Ha tirim ihe, b͕uem mma;Ndi-nche mb͕idi nile nke obodo chipuru ákwà-nb͕ochim n'arum.

8. Ab͕awom unu iyi, unu umu-ndinyom Jerusalem, ọ buru na unu ahu onye ihe-ya nātọm utọ,Gini ka unu gēgosi ya? Na onye ọria ihu-n'anya nāria ka m'bu.

9. Gini ka onye ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ,Gi onye mara nma n'etiti ndinyom?Gini ka ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ,Na i b͕awo ayi iyi otú a?

10. Onye ihe-ya nātọm utọ di ọcha nācha kwa uhie uhie,Onye emeworo ka ọ di elu dika ọkọlọtọ kari orú nnù na nnù ise.

11. Isi-ya di ka ọla-edo ọma nke anuchara anucha,Agiri-isi-ya nēruda eruda dika igu nkwu, nēji nji dika ugolo-ọma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Nke Abù 5