Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Nke Abù 2:10-17 Bible Nso (IGBOB)

10. Onye ihe-ya nātọm utọ zara, sim,Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.

11. N'ihi na, le, mb͕e oyi agabigawo,Oké miri-ozuzo agawo, ọ lawo;

12. Ahuwo okoko-ọhia anya n'ala;Mb͕e abù ọma nke umu-nnunu eruwo,Anuwo kwa olu nduru n'ala-ayi;

13. Osisi fig achawo nkpuru fig-ya nāchaghi acha,Osisi vine nile nāb͕awa okoko,Ha esìpuwo ísì utọ ha.Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.

14. Gi ndurum, nke di na nb͕awa nkume di elu, n'ebe-nzuzo nke ebe di nkputankpu,Me ka m'hu iru-gi, me ka m'nu olu-gi;N'ihi na olu-gi nātọ utọ, iru-gi ma-kwa-ra nma.

15. Nwuderenu ayi nkita-ọhia nile, bú nkita-ọhia di ntà, ndi nēmebi ubi-vine nile;N'ihi na ubi-vine-ayi nāb͕awa okoko.

16. Onye ihe-ya nātọm utọ bu nkem, mu onwem bu kwa nke ya:Bú onye ahu nke nāzù ìgwè aturu-ya n'etiti urodi.

17. Rue mb͕e ifufe anyasi nēfe n'ubọchi, mb͕e onyinyo nile nāb͕alaga kwa,Chigharia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, me onwe-gi ka i yie mb͕ada ma-ọbu nwa-eleN'elu ugwu nile nke Beta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Nke Abù 2