Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Nke Abù 1:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Abù nke abù, nke diri Solomon.

2. Ya were nsutu nile nke ọnu-ya sutum:N'ihi na ihu-n'anya-gi nile di nma kari manya-vine.

3. Manu-otite-gi nile nēsì ísì ọma;Manu-otite nke nēsì ísì utọ nke awusiri awusi ka aha-gi bu;N'ihi nka ka umu-ab͕ọghọ huworo gi n'anya.

4. Dọrọm; gi ka ayi gāb͕aso:Eze emewo ka m'ba n'ime-ulo-ya:Ayi gēteghari egwú ọṅù ṅuri kwa nime gi,Ayi gēhota ihu-n'anya-gi nile kari manya-vine:N'izi-ezi nile ka ha huworo gi n'anya.

5. Onye oji ka m'bu, ma amaram nma,Unu umu-ndinyom Jerusalem,Dika ulo-ikwū nile nke Kida,Dika ákwà-nkwuba nile nke Solomon.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Nke Abù 1