1. Abù nke abù, nke diri Solomon.
2. Ya were nsutu nile nke ọnu-ya sutum:N'ihi na ihu-n'anya-gi nile di nma kari manya-vine.
3. Manu-otite-gi nile nēsì ísì ọma;Manu-otite nke nēsì ísì utọ nke awusiri awusi ka aha-gi bu;N'ihi nka ka umu-ab͕ọghọ huworo gi n'anya.
4. Dọrọm; gi ka ayi gāb͕aso:Eze emewo ka m'ba n'ime-ulo-ya:Ayi gēteghari egwú ọṅù ṅuri kwa nime gi,Ayi gēhota ihu-n'anya-gi nile kari manya-vine:N'izi-ezi nile ka ha huworo gi n'anya.
5. Onye oji ka m'bu, ma amaram nma,Unu umu-ndinyom Jerusalem,Dika ulo-ikwū nile nke Kida,Dika ákwà-nkwuba nile nke Solomon.