Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù-Ákwá 5:6-17 Bible Nso (IGBOB)

6. Ijipt ka ayi kweyeworo ekweye,Ya na Asiria, ka nri we ju ayi afọ.

7. Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu;Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha.

8. Ndi-orù achiwo ayi:Ọ dighi onye nānaputa ayi n'aka-ha.

9. Ayi ji ndu-ayi n'aka weta nri-ayiN'ihi mma-agha nke ọzara.

10. Akpukpọ-aru-ayi di ọku dika ite-ọku ukuSite n'ifufe di ọku nke oké ugwu.

11. Ndinyom nke di na Zaion ka ha wedara n'ala,Ha na umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke n'obodo nile nke Juda.

12. Ekobere ndi-isi n'aka-ha:Asọpughi iru ndi-okenye.

13. Umu-okorọbia buru nkume-igwe-nri,Umu-okoro su-kwa-ra ngọngọ n'okpuru nkú.

14. Ndi-okenye akwusiwo inọ n'ọnu-uzọ-ama,Umu-okorọbia akwusiwo ikpọ ubọ-akwara-ha.

15. Obi-utọ nke obi-ayi akwusiwo;Otite-egwú-ayi ab͕anwewo n'ib͕a-nkpe.

16. Okpu-eze nke isi-ayi adawo n'ala:Ahuhu nādiri ayi nọ̄! n'ihi na ayi emehiewo.

17. N'ihi nka ka aru nādighi obi-ayi nma;N'ihi ihe ndia ka anya-ayi b͕aworo ọchichiri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù-Ákwá 5