Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù-Ákwá 5:3-9 Bible Nso (IGBOB)

3. Umu-nb͕ei ka ayi ghọworo, bú ndi nēnweghi nna,Nne-ayi-hà di ka ndinyom di-ha nwuru.

4. Miri-ayi ka ayi jiworo ego ṅua;Nkú-ayi nābiara ayi n'ọnu-ahia.

5. Ọ bu inọkwasi n'olu-ayi ka achuworo ayi:Ayi adọb͕uwo onwe-ayi n'ọlu, ma ekweghi ka ayi zuru ike.

6. Ijipt ka ayi kweyeworo ekweye,Ya na Asiria, ka nri we ju ayi afọ.

7. Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu;Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha.

8. Ndi-orù achiwo ayi:Ọ dighi onye nānaputa ayi n'aka-ha.

9. Ayi ji ndu-ayi n'aka weta nri-ayiN'ihi mma-agha nke ọzara.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù-Ákwá 5