3. Umu-nb͕ei ka ayi ghọworo, bú ndi nēnweghi nna,Nne-ayi-hà di ka ndinyom di-ha nwuru.
4. Miri-ayi ka ayi jiworo ego ṅua;Nkú-ayi nābiara ayi n'ọnu-ahia.
5. Ọ bu inọkwasi n'olu-ayi ka achuworo ayi:Ayi adọb͕uwo onwe-ayi n'ọlu, ma ekweghi ka ayi zuru ike.
6. Ijipt ka ayi kweyeworo ekweye,Ya na Asiria, ka nri we ju ayi afọ.
7. Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu;Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha.
8. Ndi-orù achiwo ayi:Ọ dighi onye nānaputa ayi n'aka-ha.
9. Ayi ji ndu-ayi n'aka weta nri-ayiN'ihi mma-agha nke ọzara.