3. Umu-nb͕ei ka ayi ghọworo, bú ndi nēnweghi nna,Nne-ayi-hà di ka ndinyom di-ha nwuru.
4. Miri-ayi ka ayi jiworo ego ṅua;Nkú-ayi nābiara ayi n'ọnu-ahia.
5. Ọ bu inọkwasi n'olu-ayi ka achuworo ayi:Ayi adọb͕uwo onwe-ayi n'ọlu, ma ekweghi ka ayi zuru ike.
6. Ijipt ka ayi kweyeworo ekweye,Ya na Asiria, ka nri we ju ayi afọ.
7. Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu;Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha.
8. Ndi-orù achiwo ayi:Ọ dighi onye nānaputa ayi n'aka-ha.
9. Ayi ji ndu-ayi n'aka weta nri-ayiN'ihi mma-agha nke ọzara.
10. Akpukpọ-aru-ayi di ọku dika ite-ọku ukuSite n'ifufe di ọku nke oké ugwu.
11. Ndinyom nke di na Zaion ka ha wedara n'ala,Ha na umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke n'obodo nile nke Juda.
12. Ekobere ndi-isi n'aka-ha:Asọpughi iru ndi-okenye.
13. Umu-okorọbia buru nkume-igwe-nri,Umu-okoro su-kwa-ra ngọngọ n'okpuru nkú.
14. Ndi-okenye akwusiwo inọ n'ọnu-uzọ-ama,Umu-okorọbia akwusiwo ikpọ ubọ-akwara-ha.
15. Obi-utọ nke obi-ayi akwusiwo;Otite-egwú-ayi ab͕anwewo n'ib͕a-nkpe.
16. Okpu-eze nke isi-ayi adawo n'ala:Ahuhu nādiri ayi nọ̄! n'ihi na ayi emehiewo.
17. N'ihi nka ka aru nādighi obi-ayi nma;N'ihi ihe ndia ka anya-ayi b͕aworo ọchichiri.
18. N'ihi ugwu Zaion, nke tọb͕ọrọ n'efu;Nkita-ọhia ejeghariwo na ya.