Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 9:10-13 Bible Nso (IGBOB)

10. I gālu-kwa-ra ya ọlu ala-ubi, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na ndi-orù-gi; i gēwebata kwa nkpuru ọ miri, ka nwa onye-nwe-gi we nwe nri ọ gēri: ma Mefiboshet nwa onye-nwe-gi gēri nri na table nkem mb͕e nile. Ma Ziba nwere umu-ndikom iri na ise na orú ndi-orù.

11. Ziba we si eze, Dika ihe nile si di, nke onye-nwem, bú eze, nyere orù-ya n'iwu, otú a ka orù-gi gēme. Eze we si, Ma Mefiboshet ganēri ihe na table nkem, dika otù nime umu eze.

12. Mefiboshet nwe-kwa-ra otù nwatakiri-nwoke, aha-ya bu Maika. Ma ndi nile ndi bi n'ulo Ziba buru Mefiboshet ndi-orù.

13. Mefiboshet we biri na Jerusalem' n'ihi na ọ bu na table eze ka ọ nēri ihe mb͕e nile; ma ya onwe-ya dara ngwurọ n'ukwu-ya abua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 9