Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 9:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Devid we si, Ọ̀ di onye ọ bula fọduru ọzọ nye ulo Sọl, ka m'we mere ya ebere n'ihi Jonatan?

2. Ulo Sọl nwere otù orù, aha-ya bu Ziba, ha we kpọ ya biakute Devid; eze we si ya, Gì onwe-gi bu Ziba? Ọ si, Orù-gi bu ya.

3. Eze we si, Ọ̀ dighi nwoke fọduru ulo Sọl ọzọ, ka m'we mere ya ebere Chineke? Ziba we si eze, Otù nwa-nwoke fọduru Jonatan, nke dara ngwurọ n'ukwu-ya abua.

4. Eze we si ya, Òle ebe ọ nọ? Ziba we si eze, Le, Onye ahu nọ n'ulo Makia nwa Amiel, nime Lodeba.

5. Eze, bú Devid, we ziga kuputa ya n'ulo Makia nwa Amiel, site na Lo-deba.

6. Mefiboshet, nwa Jonatan, nwa Sọl, we biakute Devid, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala. Devid we si, Mefiboshet, Ọ si, Le orù-gi!

7. Devid we si ya, Atula egwu; n'ihi na aghaghm imere gi ebere n'ihi Jonatan, bú nna-gi, m'gēweghachi-kwa-ra gi ubi nile nke Sọl nna-gi; gi onwe-gi gēri kwa nri na table nkem mb͕e nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 9