Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 8:13-18 Bible Nso (IGBOB)

13. Devid we mere onwe-ya aha mb͕e o siri n'itib͕u Siria nime Ndagwurugwu Nnù lata, bú orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise.

14. O tiye-kwa-ra ebe-nguzo-ndi-agha n'Edom: n'Edom nile ka o tiyere ebe-nguzo-ndi-agha, Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula ọ jere.

15. Devid we buru eze Israel nile; Devid we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere n'ikpe na ezi omume.

16. Joab nwa Zeruaia bu onye-isi usu-ndi-agha; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta:

17. Zedok nwa Ahaitub, na Ahimelek nwa Abaiata, bu ndi-nchu-àjà; Seraia bu ode-akwukwọ;

18. Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n'ije ozi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 8