Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 6:11-23 Bible Nso (IGBOB)

11. Ib͕e Jehova we nọdu n'ulo Obed-edom, bú onye Gat, ọnwa atọ: Jehova we gọzie Obed-edom na ulo-ya nile.

12. Ewe gosi eze, bú Devid, si, Jehova agọziwo ulo Obed-edom na ihe nile o nwere, n'ihi ib͕e Chineke. Devid we were ọṅu je, si n'ulo Obed-edom bugota ib͕e Chineke n'obodo Devid.

13. O rue, mb͕e ndi nēbu ib͕e Jehova zọrọ nzọ-ukwu isi, na ọ churu ehi na nwa-ehi mara abuba n'àjà.

14. Devid were kwa ike-ya nile te egwún'iru Jehova; ewere ephod ákwà ọcha ke Devid n'ukwù.

15. Devid na ulo Israel nile we were iti-nkpu, were kwa olu opì-ike, nēbugota ib͕e Jehova.

16. O rue, mb͕e ib͕e Jehova batara n'obodo Devid, na Maikal nwa-nwayi Sọl lepuru anya na window, hu eze, bú Devid, ka ọ nāwuli, nēte kwa egwú, n'iru Jehova; o we leda ya anya n'obi-ya.

17. Ha we bubata ib͕e Jehova, guzo ya n'ọnọdu-ya, n'etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: Devid we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Jehova.

18. Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n'aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha.

19. O we kesara ndi Israel nile, bú ìgwè nile nke Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otú ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami. Ndi Israel nile we la, nwoke ọ bula n'ulo-ya.

20. Devid we lata igọzi ulo-yaz. Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, we puta izute Devid, si, Le, otú eze Israel di nsọpuru nke-uku ta, onye kpupuru uwe n'aru-ya ta n'anya ndi-orù-nwayi nke ndi-orù-ya, dika otù nime ndikom efu nēkpupu uwe n'aru-ya ekpupu!

21. Devid we si Maikal, Ọ bu n'iru Jehova, Onye rọputaramn kari nna-gi, kari kwa ulo-ya nile, inyem iwu ibu onye-ndú ndi Jehova, bú Israel: m'we gwú egwu n'iru Jehova.

22. Ma m'gēweta-kwa-ra onwem nkọcha kari nka, m'gādi kwa ala n'anyam: ma ndi orù-nwayi ndi i kwuru okwu bayere ha, n'etiti ha ka agāsọpurum.

23. Ma Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, o nweghi nwa rue ubọchi ọnwu-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 6