Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 6:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Devid we chikọta kwa ndikom nile arọputara arọputa n'Israel, orú nnù madu uzọ atọ na nnù iri-na-ise.

2. Devid we bilie, si na Beale Juda je, ya na ndi Israel nile ndi ya na ha nọ, isi n'ebe ahu bugota ib͕e Chineke, nke akpọkwasiri Aha, bú aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha Onye nānọkwasi cherubim.

3. Ha we me ka ub͕ọ-ala ọhu būru ib͕e Chineke, ha we buputa ya n'ulo Abinadab nke di n'ugwu ntà: Uza na Ahio, bú umu Abinadab, we nēdu ub͕ọ-ala ọhu ahu.

4. Ha we buputa ya n'ulo Abinadab nke di n'ugwu ntà, ya na ib͕e Chineke: Ahio we nēje n'iru ib͕e ahu.

5. Devid na ulo Israel nile nēgwu egwū n'iru Jehova, were ihe nile eji osisi fir me, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na castanet, na ájà.

6. Ha we biarue ebe-nzọcha-ọka Nakon, Uza we setia aka-ya rue ebe ib͕e Chineke di, jide ya, n'ihi na ehi nāb͕a ukwu.

7. Iwe Jehova we di ọku megide Uza; Chineke we tib͕ue ya n'ebe ahu n'ihi nmehie-ya; o we nwua n'ebe ahu n'akuku ib͕e Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 6