Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 5:17-22 Bible Nso (IGBOB)

17. Ndi Filistia we nu na ha tere Devid manu ibu eze Israel, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid; Devid we nu ya, rida n'ebe ahu ewusiri ike.

18. Ma ndi Filistia biara, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim.

19. Devid we jua Jehova ase, si, M'gārigokuru ndi Filistia? Ì gēnye ha n'akam? Jehova we si Devid, Rigo: n'ihi na aghaghm inye ndi Filistia n'aka-gi.

20. Devid we biarue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n'ebe ahu; o we si, Jehova ekwopuwo megide ndi-irom n'irum, dika nkwopu miri. N'ihi nka ka ọ kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim.

21. Ha we rapu arusi nile ha n'ebe ahu, Devid na ndikom-ya we chiri ha.

22. Ndi Filistia we rigo kwa ọzọ, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 5