Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 5:12-20 Bible Nso (IGBOB)

12. Devid we mara na Jehova emewo ya ka o guzosie ike ibu eze Israel, ọ ma-kwa-ra na O buliwo ala-eze-ya n'elu n'ihi ndi-Ya, bú Israel.

13. Devid we si na Jerusalem kuru ndi-iko nwayi na ndinyom ọzọ, mb͕e o siri na Hebron biasi: ewe muara Devid umu-ndikom na umu-ndinyom ọzọ

14. Ndia bu kwa aha ndi amuru ya na Jerusalem; Shamua, na Shobab, na Netan, na Solomon,

15. na Ibha, na Elishua; na Nefeg, na Jafia;

16. na Elishama, na Eliada, na Elifelet.

17. Ndi Filistia we nu na ha tere Devid manu ibu eze Israel, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid; Devid we nu ya, rida n'ebe ahu ewusiri ike.

18. Ma ndi Filistia biara, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim.

19. Devid we jua Jehova ase, si, M'gārigokuru ndi Filistia? Ì gēnye ha n'akam? Jehova we si Devid, Rigo: n'ihi na aghaghm inye ndi Filistia n'aka-gi.

20. Devid we biarue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n'ebe ahu; o we si, Jehova ekwopuwo megide ndi-irom n'irum, dika nkwopu miri. N'ihi nka ka ọ kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 5