Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 3:32-39 Bible Nso (IGBOB)

32. Ha we lìe Abnea nime Hebron: eze we welie olu-ya kwa ákwà n'ílì Abnea; ndi Israel nile we kwa ákwà.

33. Eze we bùara Abnea abù-ákwà, si,Ọ̀ bu dika onye-nzuzu nānwu ka Abnea gānwu?

34. Ekeghi aka-gi abua ab͕u, emeghi kwa ka ukwu-gi abua biarue nso ihe ọla eji ke ukwu ab͕u:Dika onye nāda n'iru ndi ajọ omume, otú a ka i dara.Ndi Israel nile we kwara ya ákwá ọzọ.

35. Ndi ahu nile we bia ime ka Devid rie nri mb͕e ubọchi fọduru; ma Devid ṅuru iyi, si, Chineke mem otú a, me kwa ihe ọzọ otú a, ọ buru na edetum nri ọnu, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ, tutu ọdida-anyanwu.

36. Ndi-ya nile we mata, ọ di nma n'anya-ha: dika ihe ọ bula eze mere di nma n'anya ndi-ya nile.

37. Ndi-ya nile na Israel nile we mara n'ubọchi ahu na o siteghi n'aka eze ime ka Abnea nwa Nea nwua.

38. Eze we si ndi-orù-ya, Únu amaghi na onye-isi na onye uku adawo n'Israel ta?

39. Ma mu onwem akaghi aru ta, ọ bu ezie na abum onye etere manu ibu eze; ndikom ndia, bú umu Zeruaia, di kwa ike karim: Jehova kwughachi onye nēme ihe ọjọ dika ihe ọjọ ya si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 3