Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 3:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Agha ahu we di ogologo n'etiti ulo Sọl na ulo Devid: ma Devid di ike nāga n'iru, ma ulo Sọl enweghi ike nāla azu azu.

2. Ewe muara Devid umu-ndikom nime Hebron: ọkpara-ya bu Amnon, nke Ahinoam, bú nwayi Jezreel, muru;

3. nwa-ya nwoke nke-abua bu Kileab, nke Abigail nwunye Nebal, bú onye Kamel, muru; nke-atọ bu Absolom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua;

4. nke-anọ bu Adonaija nwa Hagit; nke-ise bu Shefataia nwa Abital;

5. nke-isi bu Itream, nke Egla nwunye Devid muru. Ndia ka amuru Devid nime Hebron.

6. O rue, mb͕e agha di n'etiti ulo Sọl na ulo Devid, na Abnea nēme onwe-ya ka ọ di ike n'ulo Sol.

7. Ma Sọl nwere iko-nwayi, aha-ya bu Rizpa, nwa-nwayi Aia. Ish-boshet we si Abnea, Gini mere i bakuru iko-nwayi nnam?

8. Iwe Abnea we di ọku nke-uku n'ihi okwu Ish-boshet, ọ si, Ọ̀ bu isi nkita nke ulo Juda nwere ka m'bu? Ta ka m'nēmere ulo Sọl, bú nna-gi, nēme-kwa-ra umu-nne-ya, nēme-kwa-ra ndi-eyì-ya, ebere, emeghkwam ka i rue Devid aka, ma i nēbom ebubo ajọ omume bayere nwayi a ta.

9. Chineke me Abnea otú a, me kwa ya ihe ọzọ otú a, ma asi na emereghm Devid ọbuná otú a, bú dika Jehova ṅuworo ya iyi;

10. ime ka ala-eze si n'ulo Sọl gabiga, na ime ka oche-eze Devid guzosie ike n'elu Israel na n'elu Juda, site na Dan we rue na Bia-sheba.

11. Ma ọ pughi izaghachi Abnea okwu ọzọ, n'ihi na ọ turu egwu ya.

12. Abnea we zigara Devid ndi-ozi n'ọnọdu ya, si, Ònye nwe ala? ọ si-kwa-ra, Ka mu na gi b͕a ndu, ma, le, akam gādiri gi, ime ka Israel nile chigharia biakute gi.

13. Ọ we si, Ọ di nma; mu onwem na gi gāb͕a ndu: nání, otù ihe ka mu onwem nāju n'aka-gi, si, I gaghi-ahu irum, ma ọ buru na i bughi uzọ me ka Maikal nwa Sọl bia, mb͕e i gābia ihu irum.

14. Devid we zigara Ish-boshet nwa Sọl ndi-ọzi, si, Nyem nwunyem, bú Maikal, onye m'ji ọgu api ise nke ndi Filistia lutara onwem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 3