Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 24:12-18 Bible Nso (IGBOB)

12. Je gwa Devid okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ihe atọ ka Mu onwem nēbokwasi gi; rọputara onwe-gi otù nime ha, ka M'we me gi ya.

13. Gad we biakute Devid, si, ya, Ọ̀ bu oké unwu arọ asa gābiakute gi n'ala-gi? mà-ọbu na i ganāb͕alaga n'iru ndi nākpab͕u gi ọnwa atọ, mb͕e ndi ahu nāchu gi: mà-ọbu na ajọ ọria nēfe efe gādi n'ala-gi ubọchi atọ? ub͕u a mata, le kwa okwu m'gēweghachiri Onye nēzitem.

14. Devid we si Gad, Anọm na nkpà nke-uku: biko, ka ayi dabà n'aka Jehova; n'ihi na obi-ebere-Ya bara uba: ma ka m'ghara idabà n'aka madu.

15. Jehova we tiye ajọ ọria nēfe efe n'aru Israel site n'ututu we rue na mb͕e ákàrà: orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise we nwua n'etiti ndi Israel site na Dan we rue Bia-sheba.

16. Mọ-ozi we setipu aka-ya n'ebe Jerusalem di ibibi ya, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu we si mọ-ozi ahu nke nēbibi n'etiti ndi Israel, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nọ n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus.

17. Devid we gwa Jehova okwu, mb͕e ọ huru mọ-ozi ahu nke nētib͕u ndi Israel, ọ si, Le, mu onwem emehiewo, mu onwem emewo kwa ajọ omume: ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam.

18. Gad we biakute Devid n'ubochi ahu, si ya, Rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 24