26. N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere,N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;
27. N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha;Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi Onye-nb͕á.
28. I gāzọputa kwa ndi ewedara n'ala:Ma anya-Gi abua dikwasi ndi di elu, ka I we me ka ha di ala.
29. N'ihi na Gi onwe-gi bu oriọnam, Jehova:Jehova nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.
30. N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe:Anamesite na Chinekem wubiga mb͕idi.
31. Chineke, uzọ-Ya zuru okè:Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;Ọta ka ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.
32. N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova?Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?
33. Chineke bu ebem siri ike nke di ike nke-uku:Ọ nākwazu kwa uzọm.
34. O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:N'elu ebem di elu ka Ọ nēguzokwam.
35. O nēzí akam abua ibu agha;Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.
36. I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.
37. I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum,Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.