Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 20:8-21 Bible Nso (IGBOB)

8. Mb͕e ndi ahu nọ n'akuku nkume uku nke di na Gibeon, Amasa biara n'iru ha. Ma ekeworo Joab ihe-ọkiké, uwe-nwuda-ya ka o yikwasiri, ihe-ọkiké di kwa n'elu ya, ya na mma-agha ekekọtara n'úkwù-ya n'ọbọ-ya; ma mb͕e Joab putara mma-agha we dapu.

9. Joab we si Amasa, Ọ̀ bu n'udo ka i nọ, nwa-nnem? Joab we were aka-nri-ya jide Amasa n'afu-ọnu isutu ya ọnu.

10. Ma Amasa elezighi anya na mma-agha nke di n'aka Joab: o we were ya tie ya n'okpuru ọgiriga nke-ise, wusi ngiri-afọ-ya n'ala, ma o tighi kwa ya ọzọ; o we nwua. Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, we chua Sheba nwa Bikri n'azu.

11. Ma otù nwoke n'etiti umu-okorọbia Joab guzoro n'akuku ya, si, Onye ọ bula ihe Joab nātọ utọ, na onye ọ bula diri Devid, ya so Joab n'azu.

12. Ma Amasa nāturu n'ọbara n'etiti uzọ atuliri atuli. Nwoke ahu we hu na ndi Israel nile guzoro, o we bupu Amasa n'uzọ atuliri atuli chigharia n'ọhia, tukwasi uwe n'elu ya, mb͕e ọ huru na onye ọ bula nke biara n'ebe ọ di guzoro.

13. Mb͕e ebupusiri ya n'uzọ atuliri atuli, ndikom nile gabigara iso n'azu Joab, ichu Sheba nwa Bikri n'azu.

14. O we gabiga n'ebo nile nke Israel rue Ebel, na Bet-meaka, na ndi Bia nile: ewe kpọkọta ha, ha we bia so kwa ya n'azu.

15. Ha we bia nọchigide ya n'agha n'Ebel Bet-meaka, wukọta ihe-ntukọba imegide obodo ahu, o we guzo nime ékpè: ndi nile soro Joab nēbibimb͕idi, ime ka ọ da.

16. Otù nwayi nke mara ihe we si n'obodo ahu kpọ òkù, si, Nurunu, nurunu; biko, sinu Joab, Biarue nso n'ebe a, ka m'gwa gi okwu.

17. O we biarue ya nso; nwayi ahu we si, Gì onwe-gi bu Joab? Ọ si, Mu onwem bu ya. Nwayi ahu we si ya, Nuru okwu nile nke orù-gi nwayi. Ọ si Anamanu nọ̄.

18. Nwayi ahu we kwue, si, Ha nēkwu ekwu na mbu, si, Ha aghaghi iju ase n'Ebel: otú a ka ha kwuzu-kwa-ra okwu.

19. Mu onwem bu otù onye nime ndi-udo ndi kwesiri ntukwasi-obi n'Israel: gi onwe-gi nāchọ ime ka otù obodo na otù nne n'Israel nwua: n'ìhi gini ka i gēloda ihe-nketa Jehova?

20. Joab we za, si, Ya burum ihe-árú, ya burum ihe-árú; m'gaghi-eloda ma-ọli, m'gaghi-ebibi kwa ma-ọli.

21. Ọ bughi otú a ka okwu a di: kama otù nwoke nke sitere n'ugwu Efraim, Sheba nwa Bikri bu aha-ya, o weliri aka-ya imegide eze, bú imegide Devid: nyenum ya, nání ya, ka m'si n'obodo a la. Nwayi ahu we si Joab, Le, agātuputara gi isi-ya nime mb͕idi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 20