Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 20:17-22 Bible Nso (IGBOB)

17. O we biarue ya nso; nwayi ahu we si, Gì onwe-gi bu Joab? Ọ si, Mu onwem bu ya. Nwayi ahu we si ya, Nuru okwu nile nke orù-gi nwayi. Ọ si Anamanu nọ̄.

18. Nwayi ahu we kwue, si, Ha nēkwu ekwu na mbu, si, Ha aghaghi iju ase n'Ebel: otú a ka ha kwuzu-kwa-ra okwu.

19. Mu onwem bu otù onye nime ndi-udo ndi kwesiri ntukwasi-obi n'Israel: gi onwe-gi nāchọ ime ka otù obodo na otù nne n'Israel nwua: n'ìhi gini ka i gēloda ihe-nketa Jehova?

20. Joab we za, si, Ya burum ihe-árú, ya burum ihe-árú; m'gaghi-eloda ma-ọli, m'gaghi-ebibi kwa ma-ọli.

21. Ọ bughi otú a ka okwu a di: kama otù nwoke nke sitere n'ugwu Efraim, Sheba nwa Bikri bu aha-ya, o weliri aka-ya imegide eze, bú imegide Devid: nyenum ya, nání ya, ka m'si n'obodo a la. Nwayi ahu we si Joab, Le, agātuputara gi isi-ya nime mb͕idi.

22. Nwayi ahu we biakute ndi obodo ahu nile n'amam-ihe-ya. Ha we bipu isi Sheba nwa Bikri, tupuru ya Joab. O we fùa opì-ike, ha we si n'obodo ahu b͕asa, nwoke ọ bula ọ la n'ulo-ikwū-ya. Joab we lata na Jerusalem jekuru eze.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 20